1 Ndị Eze 18

Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.

1 Kings 18:22 (UKJV) Then said Elijah unto the people, I, even I only, remain a prophet of the LORD; but Baal's prophets are four hundred and fifty men.

20Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.

21Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.” Ma ndị zukọrọ nʼebe ahụ ekwughị ihe ọbụla.

22Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.

23Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya.

24Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.” Ndị Izrel niile zara sị, “Okwu gị dị mma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.