1 Ndị Eze 18

Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”

1 Kings 18:27 (UKJV) And it came to pass at noon, that Elijah mocked them, and said, Cry aloud: for he is a god; either he is talking, or he is pursuing, or he is in a journey, or possibly he sleeps, and must be awaked.

25Ịlaịja gwara ndị amụma Baal, sị, “Ebe unu dị ọtụtụ, burunu ụzọ họrọ otu oke ehi nʼime ehi abụọ a dozie ya. Unu amụnyekwala ya ọkụ nʼokpuru, kama kpọkuonụ chi unu.”

26Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro.

27Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”

28Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.

29Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.