28Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.
29Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị.
30Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ.
31Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo Jekọb, onye okwu Onyenwe anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ Izrel.”
32O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu.