1 Ndị Eze 18

Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.

1 Kings 18:46 (UKJV) And the hand of the LORD was on Elijah; and he girded up his loins, and ran before Ahab to the entrance of Jezreel.

44O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.” Ya mere, Ịlaịja sịrị, “Gaa gwa Ehab, ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’ ”

45Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa Jezril.

46Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.