1 Ndị Eze 19

Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”

1 Kings 19:13 (UKJV) And it was so, when Elijah heard it, that he wrapped his face in his mantle, and went out, and stood in the entering in of the cave. And, behold, there came a voice unto him, and said, What do you here, Elijah?

11Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.

12Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara.

13Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”

14Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”

15Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.