1 Ndị Eze 19

Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”

1 Kings 19:20 (UKJV) And he left the oxen, and ran after Elijah, and said, Let me, I pray you, kiss my father and my mother, and then I will follow you. And he said unto him, Go back again: for what have I done to you?

18Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”

19Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.

20Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.” Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”

21Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.