39Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ, ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’
40Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
41Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
42Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ”
43Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria.