7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”
8Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.”
9Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru.
10Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.”
11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ”