1 Ndị Eze 21

Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.

1 Kings 21:8 (UKJV) So she wrote letters in Ahab's name, and sealed them with his seal, and sent the letters unto the elders and to the nobles that were in his city, dwelling with Naboth.

6Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.”

7Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.”

8Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.

9Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa.

10Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.