1 Ndị Eze 22

Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’

1 Kings 22:21 (UKJV) And there came forth a spirit, and stood before the LORD, and said, I will persuade him.

19Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.

20Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.

21Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’

22“ ‘Onyenwe anyị jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ “ ‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara. “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’

23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.