32Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise.
33O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
34Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.