6Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze. Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.
7Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.
8Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ. Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.
9Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.
10Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.