8Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ.
9E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya.
10Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii.
11Nʼelu nkume ndị a ka e doro nkume ndị ọzọ, ndị dị ezi mma, a waziri awazi dịka ọtụtụ si dị. Emesịa, e dokwara osisi sida nʼelu ha.
12Ogige ukwu ahụ bụ nke eji ahịrị nkume atọ a wara awa dịkwasịrị nʼelu ibe ya gbaa gburugburu, otu ahịrị bụ nke sida a wara awa dịka ọ dị nʼime ime ogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, ya na mpụta ọnụ ụlọ ya.