1 Ndị Eze 7

Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha.

1 Kings 7:20 (UKJV) And the capitals upon the two pillars had pomegranates also above, opposite to the belly which was by the network: and the pomegranates were two hundred in rows round about upon the other capital.

18Ọ kpụrụ ihe yiri mkpụrụ pomegranet, nke dị nʼahịrị abụọ, nke o ji gbaa ihe ịchọ mma ndị ahụ gburugburu, maka iji ha chọọ ihe ọkpụkpụ ọla ndị ahụ dị nʼelu ogidi ndị ahụ mma. O mere otu ihe a maka ihe ọkpụkpụ ọla ọbụla.

19Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.

20Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha.

21O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ na mgbe ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.

22Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.