1 Ndị Eze 7

Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.

1 Kings 7:31 (UKJV) And the mouth of it within the capital and above was a cubit: but the mouth thereof was round after the work of the base, a cubit and an half: and also upon the mouth of it were engravings with their borders, foursquare, not round.

29Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.

30Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.

31Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.

32A na-adọkpụgharị ihe ndọkwasị a nʼụkwụ anọ o nwere. A dụnyekọtakwara ụkwụ anọ ndị a nʼime okporo ọla e mekọtara ya na ihe ndọkwasị ahụ. Ịdị elu nke ụkwụ ọbụla bụ iri sentimita isii na asatọ.

33E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.