1 Ndị Eze 7

Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.

1 Kings 7:38 (UKJV) Then made he ten lavers of brass: one vessel that holds water contained forty baths: and every vessel that holds water was four cubits: and upon every one of the ten bases one vessel that holds water.

36Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.

37Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.

38Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.

39Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda.

40Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.