1 Ndị Eze 7

Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.

1 Kings 7:42 (UKJV) And four hundred pomegranates for the two networks, even two rows of pomegranates for one network, to cover the two bowls of the capitals that were upon the pillars;

40Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.

41Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma.

42Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.

43Ihe ndọkwasị iri na efere ịsa mmiri iri nke dọkwasịrị nʼelu ha;

44na Oke osimiri ahụ na oke ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.