18Ma Onyenwe anyị sịrị nna m, Devid, ‘I mere nke ọma ibu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.
19Ma otu ọ dị, ọ bụghị gị ga-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, kama ọ bụ nwa gị nwoke, anụ ahụ gị na ọbara gị; ọ bụ ya ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’
20“Ugbu a, Onyenwe anyị emezuola nkwa ahụ o kwere. A nọchiela m nna m Devid, ugbu a, ana m anọdụ nʼocheeze nke Izrel dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Ewuokwala m ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.
21Edoziekwala m ọnọdụ ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ ga-adị, nʼime ya ka ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị, bụ nke ya na nna nna anyị ha gbara, mgbe o mere ka ha si nʼala Ijipt pụta.”
22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu,