1 Ndị Eze 8

ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị;

1 Kings 8:48 (UKJV) And so return unto you with all their heart, and with all their soul, in the land of their enemies, which led them away captive, and pray unto you toward their land, which you gave unto their fathers, the city which you have chosen, and the house which I have built for your name:

46“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;

47ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe ahụ eji ha rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, anyị emekwala ajọ omume’;

48ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị;

49mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka.

50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.