1 Ndị Eze 8

Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.

1 Kings 8:65 (UKJV) And at that time Solomon held a feast, and all Israel with him, a great congregation, from the entering in of Hamath unto the river of Egypt, before the LORD our God, seven days and seven days, even fourteen days.

63Solomọn chụrụ aja udo, bụ nke ọ chụrụ nye Onyenwe anyị. Ehi dị puku iri abụọ na abụọ, na ewu na atụrụ dị narị puku na iri puku abụọ. Ya mere, eze na ndị Izrel niile si otu a doo ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ.

64Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, eze doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke na-eguzo nʼihu Chineke dị oke nta ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba udo niile ahụ.

65Ya mere, Solomọn ya na ndị Izrel niile mere mmemme a nʼoge ahụ, ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. Ha mere mmemme a nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, ụbọchị asaa tinyere ụbọchị asaa ọzọkwa, ya bụ agụkọta ha ụbọchị iri na anọ.

66Nʼụbọchị nke na-eso ya, o zilagara ndị ahụ niile. Ha gọziri eze, laakwa nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị meere ohu ya Devid, na ndị ya Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.