1 Ndị Eze 9

Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.

1 Kings 9:18 (UKJV) And Baalath, and Tadmor in the wilderness, in the land,

16Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.

17Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,

18Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.

19O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.

20Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.