11ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.
12E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a.
13Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.
14Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
15Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.