1 Pita 2

Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,

1 Peter 2:13 (UKJV) Submit yourselves to every ordinance of man for the Lord's sake: whether it be to the king, as supreme;

11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.

12Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa.

13Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,

14maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.

15Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.