14maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.
15Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.
16Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
17Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze.
18Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.