4Bịakwutenụ ya, Nkume ahụ dị ndụ, onye ụmụ mmadụ jụrụ, maọbụ onye Chineke họpụtara, onye dị oke ọnụahịa nye ya.
5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.
6Nʼihi nʼakwụkwọ nsọ kwuru, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke a họpụtara, bụkwa nkume isi ntọala dị oke ọnụahịa. Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
7Ma nye unu ndị kwere ekwe nkume a dị oke ọnụahịa, ma nʼebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ, “Ọ bụ nkume nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.”
8Ọ bụ kwa, “Nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa.” Ha na-asọ ngọngọ nʼihi na ha jụrụ irube isi nʼokwu ahụ. Nke a bụkwa ihe a kara aka banyere ha.