1 Pita 3

Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.

1 Peter 3:4 (UKJV) But let it be the hidden man of the heart, in that which is not corruptible, even the ornament of a meek and quiet spirit, which is in the sight of God of great price.

2mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.

3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.

4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.

5Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.

6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.