15Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike.
16Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.
17Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. Ọ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke?
18Ma, “Ọ bụrụkwa na ọ dị ike ịzọpụta onye ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị onye na-amaghị Chineke na onye mmehie?”
19Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.