1 Pita 4

Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.

1 Peter 4:2 (UKJV) That he no longer should live the rest of his time in the flesh to the lusts of men, but to the will of God.

1Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie.

2Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke.

3Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.

4Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.