1 Pita 4

Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.

1 Peter 4:7 (UKJV) But the end of all things is at hand: be all of you therefore sober, and watch unto prayer.

5Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.

6Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa oziọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e kperela ikpe mgbe ha dị ndụ, dịka e si ekpe mmadụ niile ikpe, ka ha site na nke a bie ndụ dị ka Chineke si chọọ site na mmụọ ahụ.

7Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.

8Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.

9Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.