1Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a,
2na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi.
3Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
4Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”