1 Pita 5

Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.

1 Peter 5:8 (UKJV) Be sober, be vigilant; because your adversary the devil, as a roaring lion, walks about, seeking whom he may devour:

6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.

7Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.

8Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.

9Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.

10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.