1 Samuel 1

Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”

1 Samuel 1:17 (UKJV) Then Eli answered and said, Go in peace: and the God of Israel grant you your petition that you have asked of him.

15Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.

16Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.”

17Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”

18Hana zara sị, “Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma.” O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.

19Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.