1 Samuel 11

Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”

1 Samuel 11:14 (UKJV) Then said Samuel to the people, Come, and let us go to Gilgal, and renew the kingdom there.

12Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”

13Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”

14Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”

15Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.