1 Samuel 11

Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”

1 Samuel 11:3 (UKJV) And the elders of Jabesh said unto him, Give us seven days' respite, that we may send messengers unto all the coasts of Israel: and then, if there be no man to save us, we will come out to you.

1Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”

2Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”

3Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”

4Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.

5Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.