2Ugbu a, unu enweela eze, onye bụ onyendu unu. Ma nʼebe mụ onwe m nọ, abụrụla m agadi isi awọ, ụmụ m ndị ikom so nọrọkwa nʼetiti unu. Abụ m onyendu unu site na mgbe m bụ okorobịa ruo taa.
3Lee m ka m guzo nʼihu unu. Gbaanụ ama megide m nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu onye ya o tere mmanụ. Onye ka m zuuru ehi ya? Onye ka m zuuru ịnyịnya ibu ya? Ọ dị onye m ghọgburu? Ọ dị onye m megburu? Ọ dị onye m si nʼaka ya nara ego aka azụ ime ka m ghara ikpe ikpe ziri ezi? Gwanụ m ma ọ bụrụ na m mere ihe ndị a, aga m emezi ya.”
4Ha zara sị, “Mba ọ dịbeghị mgbe ị ghọgburu anyị, maọbụ kpagbuo anyị, nʼụzọ ọbụla. O nweghịkwa onye i si nʼaka ya were ihe ọbụla.”
5Samuel zara sị ha, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe megide unu. Otu a kwa, onye ya o tere mmanụ bụ onye akaebe taa, na unu achọtaghị ihe ọbụla nʼaka m.” Ha zara sị, “E, ọ bụ onye akaebe!”
6Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta.