40Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”
41Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara, nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel.
42Mgbe ahụ, Sọl kwuru sị, “Ugbu a feenụ nza nʼetiti mụ na Jonatan, nwa m nwoke.” Nza ahụ mara Jonatan.
43Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?”
44Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Nʼezie Jonatan, ị ghaghị ịnwụ. Ka Chineke meso m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si sie ike, ma ọ bụrụ na ị nwụghị nʼihi ihe a i mere.”