4Tupu Jonatan eruo ebe ndị Filistia nọ, ọ ghaghị isite na nwa ụzọ warawara dị nʼagbata nkume abụọ, a na-akpọ Bozez na Sene gabiga.
5Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba.
6Jonatan gwara nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ga nʼebe nguzo ndị ahụ a na-ebighị ugwu, ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-alụrụ anyị ọgụ. Nʼihi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onyenwe anyị ịzọpụta, site nʼọtụtụ mmadụ, maọbụ ole na ole.”
7Nwokorobịa ahụ zara sị ya, “Gaa nʼihu, eji m obi m na mmụọ m na-eso gị dịka ọchịchọ gị si dị.”
8Jonatan gwara ya sị, “Bịa ka anyị ga, lee ihe anyị ga-eme. Anyị ga-apụkwuru ndị agha ahụ mee ka ha hụ anyị anya.