1 Samuel 15

Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.”

1 Samuel 15:12 (UKJV) And when Samuel rose early to meet Saul in the morning, it was told Samuel, saying, Saul came to Carmel, and, behold, he set him up a place, and is gone about, and passed on, and gone down to Gilgal.

10Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị,

11“Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile.

12Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.”

13Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”

14Ma Samuel jụrụ ya sị, “Gịnị bụ ube atụrụ ndị a m na-anụ? Ebee ka ube igwe ehi ndị a si na-ada?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.