1 Samuel 15

O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile.

1 Samuel 15:8 (UKJV) And he took Agag the king of the Amalekites alive, and utterly destroyed all the people with the edge of the sword.

6Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha.

7Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt.

8O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile.

9Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.

10Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.