1 Samuel 16

Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’

1 Samuel 16:2 (UKJV) And Samuel said, How can I go? if Saul hear it, he will kill me. And the LORD said, Take an heifer with you, and say, I am come to sacrifice to the LORD.

1Emesịa Onyenwe anyị sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.”

2Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” Onyenwe anyị sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja.’

3Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.”

4Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.