1 Samuel 16

Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”

1 Samuel 16:22 (UKJV) And Saul sent to Jesse, saying, Let David, I pray you, stand before me; for he has found favour in my sight.

20Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.

21Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.

22Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.”

23Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.