18Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”
19Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha.
20Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha.
21Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
22Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha.