20Nʼoge a, a chọpụtara na Mikal, ada Sọl hụrụ Devid nʼanya, mgbe e mere ka Sọl mata nke a, obi tọrọ ya ụtọ.
21O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.”
22Sọl nyere ndị ohu ya iwu sị, “Gwanụ Devid okwu na nzuzo sị ya, ‘Lee, ihe banyere gị masịrị eze, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị nʼanya. Ugbu a, kwerenụ ịbụ ọgọ ya.’ ”
23Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.”
24Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru,