32Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị.
33Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.
34“ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.
35Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile.
36Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”