5Devid zara sị ya, “Nʼezie, anyị ekwebeghị ka ụmụ nwanyị bịa anyị nso, dịka anyị dị mbụ eme ma anyị na-eje ozi. Ndị ikom ndị a na-edo onwe ha nsọ ọ bụladị mgbe njem anyị na-adịghị nsọ ka ọfọdụzie njem nke taa.”
6Ebe nri ọzọ na-adịghị, onye nchụaja ahụ nyere Devid achịcha nsọ, bụ achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, nke ewepụtara site nʼihu Onyenwe anyị nʼime ebe ịchụ aja, debekwa achịcha ọhụrụ nke e ji gbanwee nke ochie dị nʼebe ahụ.
7Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.
8Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.”
9Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.” Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.”