1 Samuel 22

Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob.

1 Samuel 22:9 (UKJV) Then answered Doeg the Edomite, which was set over the servants of Saul, and said, I saw the son of Jesse coming to Nob, to Ahimelech the son of Ahitub.

7Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha?

8Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.”

9Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob.

10Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”

11Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.