1Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile.
2Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” Onyenwe anyị zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.”
3Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
4Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”