1 Samuel 24

Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.

1 Samuel 24:12 (UKJV) The LORD judge between me and you, and the LORD avenge me of you: but mine hand shall not be upon you.

10Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’

11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.

12Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.

13Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.

14“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.