18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.
19Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.
20Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha
21ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
22Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”