21ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya.
22Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.”
23Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid.
24Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu.
25Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere.